Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joel 1:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

16. Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n'ulo Chineke-ayi?

17. Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n'okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n'efu, akwatuwo ọba nile; n'ihi na ihere emewo ọka.

18. Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n'ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma.

19. Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joel 1