Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joel 1:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova nke ruru Joel, nwa Petuel, nti.

2. Nurunu nka, unu ndi-okenye, ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile bi n'ala nka. Nka, ọ̀ diwo n'ubọchi-unu? mà-ọbu n'ubọchi nna-unu-hà?

3. Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ.

4. Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo.

5. Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu.

6. N'ihi na otù mba arigokwasiwo n'alam, o nwere ume, nādighi kwa ọnu-ọgugu; ezé-ya nile di ka ezé ọdum, o nwe-kwa-ra ikiri-ezé nke nne-ọdum.

7. O mewo ka osisi vine nkem ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, o mewo ka osisi fig nkem ghọ irighiri-osisi: o kpechapusiwo nb͕ub͕ọ-ya, kpofue ya; emewo ka alaka-ya nile di ọcha.

8. Kwa ákwá dika nwa-ab͕ọghọ nke ekeworo ákwà-nkpe n'ihi di o nwere na nwata.

9. Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.

10. Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.

11. Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.

12. Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n'ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n'aru umu madu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joel 1