17. Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.
18. Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu,Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.
19. Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya!Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?
20. Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe:Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.
21. Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim;Ajum ndum.
22. Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.
23. Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.
24. Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?
25. Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.
26. Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.