1. Job we za, si,
2. N'ezie amawom na ọ di otú a:Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?
3. Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé,Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.
4. O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike:Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?
5. Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya,Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya.
6. Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya,Ogidi-ya nile we ma jijiji.
7. Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa;Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.