Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 8:9-21 Bible Nso (IGBOB)

9. (N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe,N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)

10. Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu,Si n'obi-ha weputa okwu?

11. Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi?Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?

12. Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.

13. Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di;Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:

14. Onye agākpaji okwukwe efu ya,Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo.

15. Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo:Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.

16. Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu,Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.

17. Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume,Ọ nāhu ebe nkume anya.

18. Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya,Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.

19. Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya,Ma ndi ọzọ gēsi n'ájá pue.

20. Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè,Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.

21. Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi,Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 8