Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 8:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo:Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.

16. Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu,Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.

17. Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume,Ọ nāhu ebe nkume anya.

18. Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya,Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.

19. Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya,Ma ndi ọzọ gēsi n'ájá pue.

20. Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè,Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.

21. Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi,Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 8