1. Bildad, bú onye Shua, we za, si,
2. Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia?Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike?
3. Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ?Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile,Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?
4. Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya,Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha:
5. Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike,We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;
6. Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu;N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi,Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.
7. Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà,Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.
8. N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu,Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:
9. (N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe,N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)
10. Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu,Si n'obi-ha weputa okwu?
11. Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi?Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?
12. Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.