Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 40:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.

15. Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.

16. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.

17. Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.

18. Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.

19. Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.

20. N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.

21. N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.

22. Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya;Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.

23. Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji:Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 40