Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 40:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we za Job, si,

2. Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nālusoOnye puru ime ihe nile ọ̀gù?Onye nābara Chineke nba, ya za ya.

3. Job we za Jehova, si,

4. Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi?Atukwasiwom, akam, n'ọnum.

5. Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa;E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.

6. Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,

7. Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara.

8. Ì nēmebi kwa ikpém?I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?

9. Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere?Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?

10. Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma;Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.

11. Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi:Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.

12. Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala;Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.

13. Zobekọ ha n'ájá;Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.

14. Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.

15. Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.

16. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 40