Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 38:30-41 Bible Nso (IGBOB)

30. N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha,Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru.

31. Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades,Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion?

32. Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya?Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?

33. Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe?Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa?

34. Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji,Ka njubiga miri we kpuchie gi?

35. Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je,Si kwa gi, Le ayi?

36. Ònye tiyeworo amam-ihe n'akuku di nime?Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta?

37. Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe?Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha,

38. Mb͕e ájá nāghọ urọ,Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n'aru onwe-ha?

39. Ì nāchuru nne-ọdum anu-ndọb͕u?Ma-ọbu ì nēme ka afọ-iri-nri umu-ọdum ju,

40. Mb͕e ha nāmakpu n'ebe-obibi-ha,Nọdu kwa n'okwu-ọhia iche anu?

41. Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya,Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 38