Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 38:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara.

4. Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa?Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.

5. Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?

6. N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,

7. Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?

8. Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;

9. Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,

10. M'we kpawara ya ókèm,Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,

11. Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?

12. Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu,Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;

13. Ka o we jide akuku nile nke uwa aka,Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?

14. Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà;Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 38