Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 38:18-33 Bible Nso (IGBOB)

18. Ì ghọtawo rue obosara uwa?Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.

19. Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè?Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;

20. Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya,Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya?

21. I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi,Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne!

22. Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow,Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,

23. Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà,Nye ubọchi ọ̀gù na agha?

24. Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè,Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa?

25. Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri,Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe;

26. Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi;Bú ọzara madu nēbighi nime ya;

27. Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n'efu;Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu?

28. Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna?Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi?

29. N'àfọ onye ka ice nēsi puta?Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya?

30. N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha,Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru.

31. Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades,Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion?

32. Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya?Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?

33. Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe?Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 38