11. Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?
12. Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu,Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;
13. Ka o we jide akuku nile nke uwa aka,Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?
14. Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà;Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe:
15. Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ,Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.
16. Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri?Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri?
17. Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu?Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu?
18. Ì ghọtawo rue obosara uwa?Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.
19. Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè?Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;
20. Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya,Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya?
21. I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi,Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne!
22. Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow,Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,
23. Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà,Nye ubọchi ọ̀gù na agha?
24. Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè,Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa?
25. Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri,Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe;
26. Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi;Bú ọzara madu nēbighi nime ya;