1. Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,
2. Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiriSite n'okwu ọmuma-ihe nādighi?
3. Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara.
4. Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa?Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.
5. Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?
6. N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,
7. Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?
8. Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;
9. Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,