Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 37:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. Ṅa nti na nka, Job:Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.

15. Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu,Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?

16. Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe,Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe?

17. Gi onye uwe-gi nēkpo ọku,Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida.

18. Ì gēso Ya me ka mbara-ígwé nile sa mbara,Nke di ike dika enyo awuru awu?

19. Me ka ayi mara ihe ayi gāsi Ya;Ayi adighi-edo okwu-ayi n'usoro n'ihi ọchichiri.

20. Àgākọrọ Ya na m'gēkwu okwu?Ma-ọbu ọ̀ di madu ọ bula siri ka eloda ya?

21. Ma ub͕u a madu ahughi ìhè nke nēb͕upu na mbara-ígwé:Ifufe we gabiga, me ka ha di ọcha.

22. N'Ugwu ka ọla-edo, bú ọmùmù-ìhè, nēsi bia:Chineke ka ebube di egwu nādikwasi.

23. Onye puru ime ihe nile, ayi achọputaghi Ya; Ọ di uku n'ike:N'ikpe na iba-uba nke ezi omume Ọ dighi-eweda n'ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 37