Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 37:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya,Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.

14. Ṅa nti na nka, Job:Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.

15. Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu,Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?

16. Ì mara otú oké igwe-oji ji kwuru efekefe,Oké ọlu nke Onye zuru okè n'ọmuma-ihe?

17. Gi onye uwe-gi nēkpo ọku,Mb͕e Ọ nēme ka uwa di jū site n'ifufe Ndida.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 37