1. Ọzọ, obim nāma jijiji bayere nka,Ọ nēme kwa nkpatu pua n'ọnọdu-ya.
2. Genu nti nke-ọma n'ime-nkpatu nke olu-Ya,Na ntamu nke nēsi n'ọnu-Ya puta.
3. N'okputu elu-igwe nile ka Ọ nēzisa ya,Ìhè-ya dikwasi kwa akuku nile nke uwa.
4. Mb͕e ọ gasiri olu nāb͕ọ uja;Ọ nēwere olu nbili-elu-Ya ma éb͕è-elu-igwe:Ọ dighi-eb͕ochi ha mb͕e anānu olu-Ya.
5. Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube;Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha.
6. N'ihi na Ọ nāsi snow,Na oké miri-ozuzo,Na oké miri-ozuzo nke miri-ozuzo-Ya di ike, Di n'ala.
7. Ọ nākachi aka madu ọ bula akàra;Ka madu nile O mere we mara ya.
8. Anu-ọhia we nābà n'ọ̀té-ya,Ọ nānọdu kwa n'ebe-obibi-ya.
9. N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia:Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia.
10. Anēsi n'iku-ume Chineke nye ice:Anēme kwa obosara miri ka ọ di warara.
11. Ọzọ, O nēji miri-ozuzo bob͕u oké igwe-oji;Ọ nāb͕asa igwe-oji nke ìhè-Ya:
12. Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya,Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwuN'elu-uwa dum madu bi:
13. Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya,Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.
14. Ṅa nti na nka, Job:Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.