Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 32:9-21 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ bughi ndi uku mara ihe,Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.

10. N'ihi nka ka m'siri, Gem nti;M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.

11. Le, echerem okwu-unu,Anamaṅa nti nghọta-unu,Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.

12. E, anamelekwasi unu anya,Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka,Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.

13. Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe;Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:

14. N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem;M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.

15. Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ:Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.

16. M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu,N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?

17. M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem,M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.

18. N'ihi na ejuputaram n'okwu;Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.

19. Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu;Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.

20. Ka m'kwue, ka aru we dajuam;M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.

21. Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma;M'gaghi-etu kwa madu aha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 32