Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 31:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.

9. Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:

10. Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.

11. N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:

12. N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.

13. Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,Mb͕e mu na ha nēse okwu:

14. Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?

15. Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?

16. Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;

17. Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;

18. (Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya,Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)

19. Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe,Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 31