Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 31:28-37 Bible Nso (IGBOB)

28. Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu.

29. Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi,Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;

30. (Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehieN'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)

31. Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi,Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!

32. Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali;Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.

33. Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam,N'izobe ajọ omumem n'obim,

34. N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba,Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ,M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-

35. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti!(Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;)Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!

36. N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya;M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.

37. M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum;Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 31