Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 31:22-31 Bible Nso (IGBOB)

22. Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.

23. N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24. Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25. Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne,Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;

26. Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu,Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;

27. Ewe rafue obim na nzuzo,Akam we sutu ọnum ọnu:

28. Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu.

29. Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi,Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;

30. (Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehieN'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)

31. Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi,Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 31