Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 31:20-36 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;

21. Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:

22. Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.

23. N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24. Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25. Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne,Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;

26. Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu,Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;

27. Ewe rafue obim na nzuzo,Akam we sutu ọnum ọnu:

28. Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu.

29. Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi,Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;

30. (Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehieN'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)

31. Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi,Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!

32. Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali;Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.

33. Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam,N'izobe ajọ omumem n'obim,

34. N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba,Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ,M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-

35. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti!(Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;)Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!

36. N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya;M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 31