Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 31:15-25 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?

16. Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;

17. Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;

18. (Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya,Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)

19. Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe,Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;

20. Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;

21. Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:

22. Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.

23. N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24. Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25. Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne,Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 31