11. N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:
12. N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.
13. Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,Mb͕e mu na ha nēse okwu:
14. Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?
15. Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?
16. Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;
17. Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;
18. (Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya,Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)
19. Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe,Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;
20. Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;
21. Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:
22. Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.
23. N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.