1. Mu na anyam abua b͕ara ndu;M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?
2. N'ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n'elu?Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n'ebe di elu?
3. Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ,Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?
4. Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile,Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?
5. Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;
6. (Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume,Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)
7. Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya,Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu,Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:
8. Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.