Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 31:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Mu na anyam abua b͕ara ndu;M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?

2. N'ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n'elu?Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n'ebe di elu?

3. Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ,Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?

4. Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile,Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?

5. Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;

6. (Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume,Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)

7. Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya,Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu,Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:

8. Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.

9. Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:

10. Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.

11. N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:

12. N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.

13. Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,Mb͕e mu na ha nēse okwu:

14. Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 31