Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 3:19-25 Bible Nso (IGBOB)

19. Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua;Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.

20. N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè?N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?

21. Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia;Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;

22. Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù,Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.

23. N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè,Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?

24. N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia,Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.

25. N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim,Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 3