13. N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jūM'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:
14. Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;
15. Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:
16. Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?
17. N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.
18. N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.
19. Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua;Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.
20. N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè?N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?
21. Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia;Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;
22. Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù,Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.
23. N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè,Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?
24. N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia,Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.
25. N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim,Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.