Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 3:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Gini mere ikperè abua di n'irum inaram?Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?

13. N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jūM'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:

14. Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;

15. Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:

16. Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?

17. N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.

18. N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.

19. Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua;Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.

20. N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè?N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 3