Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 29:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma,Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;

5. Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem,Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;

6. Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile,Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!

7. Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo,Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,

8. Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha,Ndi kara nká biliri, guzo;

9. Ndi-isi kwubìri okwu nile ha,Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha;

10. Anubìri olu ndi-ndú,Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;

11. N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma;Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:

12. N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya,Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.

13. Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim:M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.

14. Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya:Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.

15. Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ,Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 29