Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 29:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya:Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.

15. Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ,Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.

16. Nna ka m'buru ndi-ob͕eye:Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.

17. M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume,Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.

18. M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume,Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 29