Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 29:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m'si di n'ọnwa gara aga,Dika n'ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem;

3. Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya,Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;

4. Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma,Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;

5. Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem,Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;

6. Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile,Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!

7. Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo,Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,

8. Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha,Ndi kara nká biliri, guzo;

9. Ndi-isi kwubìri okwu nile ha,Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha;

10. Anubìri olu ndi-ndú,Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;

11. N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma;Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:

12. N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya,Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 29