3. Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei,Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.
4. Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye:Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.
5. Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzaraKa ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike;Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.
6. N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi;Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu.
7. Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.