Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 19:23-28 Bible Nso (IGBOB)

23. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ede okwum nile n'akwukwọ ub͕u a!Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na akà ha n'akwukwo!

24. Ma asi na eji pen ígwè na òpùKa ha n'oké nkume rue mb͕e ebighi-ebi!

25. Ma mu onwem amawo na Onye-nb͕aputam di ndu,Na O gēbili kwa ọtọ n'elu ájá n'ikpe-azu:

26. Mb͕e emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka,Ọ bu na m'gēsi n'anu-arum hu Chineke:

27. Onye mu onwem gāhuru onwem,Anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bughi kwa onye ala ọzọ.Akurum abua agwusiwo n'imem.

28. Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya?Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 19