2. Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú?Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?
3. Ub͕ò iri ndia ka unu nēme ka ihere mem:Ihere adighi-eme unu na unu nēmejọm.
4. Ọzọ kwa, ọ bu ezie na emehiewom n'amaghi-ama,Ma n'ebe m'nọ ka nmehiem m'mehiere n'amaghi-ama di.
5. Ọ buru na ọ bu ezie na ọ bu imegidem ka unu nēme onwe-unu uku,Ọ buru kwa na unu ewere ita-utam som ru uka:
6. Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ,Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.
7. Le, anameti nkpu, si, Ihe-ike! ma adighi-azam:Anametiku Chineke, ma ikpé adighi.
8. Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa,N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.