Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 17:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè,Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi.

6. Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche;Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra.

7. Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe,Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile.

8. Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru,Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.

9. Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya,Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.

10. Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia:Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.

11. Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile,Bú ihe-nnweta nke obim.

12. Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie:Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.

13. Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm;Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;

14. Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu;Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;

15. Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a?Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 17