Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 16:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá,Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;

17. Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam,Ekperem di kwa ọcha.

18. Ala, ekpuchila ọbaram,Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.

19. Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ,Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.

20. Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò:Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;

21. Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka,Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 16