Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 16:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume,N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.

12. Anọm n'udo, O we mebiem;Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam,Me ka m'biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.

13. Àkú-Ya nile dim buruburu,Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n'arum;Ọ nāwusi òlùlùm n'ala.

14. O nētipúm ntipú n'elu ntipú-ibe-ya;Ọ nāb͕akwasim dika dike.

15. Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum,Turughari mpim n'ájá.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 16