1. Job we za, si,
2. Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia:Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.
3. Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu?Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?
4. Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu;Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim,M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu,Na ifufe isim imegide unu.
5. M'gēwere ọnum b͕a unu ume,Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.
6. Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um:Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?
7. Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum:I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.