Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 15:6-19 Bible Nso (IGBOB)

6. Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.

7. Ì bu madu mbu amuru?Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?

8. Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?

9. Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?

10. Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi,Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.

11. Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?

12. Gini mere obi-gi ji ebupu gi?Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?

13. Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.

14. Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi,Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?

15. Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.

16. Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya,Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?

17. M'gēkwuputara gi, gem nti;Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:

18. (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;

19. Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 15