16. Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya,Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?
17. M'gēkwuputara gi, gem nti;Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
18. (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
19. Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)
20. Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.