Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 12:8-25 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.

9. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,Na aka Jehova emewo nka?

10. Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.

11. Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?

12. Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.

13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.

14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.

15. Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.

16. N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.

17. Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.

18. Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.

19. Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.

20. Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.

21. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.

22. Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi,We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.

23. Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì:Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.

24. Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa,We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.

25. Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè,O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 12