Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 10:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ike ndum agwuwo nkpuru-obim;Ka m'rapuru onwem ntamum;Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

2. M'gāsi Chineke, Amalam ikpe;Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.

3. Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u,Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua,We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?

4. Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 10