Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 1:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.

6. Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha.

7. Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.

8. Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

9. Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n'efu ka Job nātu egwu Chineke?

10. Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.

11. Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.

12. Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua.

13. O rue, n'otù ubọchi, mb͕e umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n'ulọ nwa-nne-ha, bú ọkpara,

14. na onye-ozi biakutere Job, si, Ìgwè ehi nādọ ihe eji gwu ala-ubi, ìgwè nne-inyinya-ibu nāta nri n'akuku ha:

15. ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

16. Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 1