Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 9:6-16 Bible Nso (IGBOB)

6. Ebe-obibi-gi di n'etiti aghughọ; n'aghughọ ka ha juru imaram; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

7. N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue otú a, si, Le, M'gaje inucha ha, we nwaputa ha; n'ihi na M'gēsi aṅa me n'ihi ada ndim?

8. Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu.

9. M'gaghi-eleta ha n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀?

10. Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.

11. M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi.

12. Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n'ìhi gini ka ala nka laworo n'iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?

13. Jehova we si, N'ihi na ha arapuwo iwum nke M'tiyere n'iru ha, na n'ihi na ha egeghi nti olum, ghara kwa ijeghari nime ya;

14. ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha:

15. n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí.

16. M'gāchusa kwa ha n'etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M'gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 9