Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 9:19-23 Bible Nso (IGBOB)

19. N'ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n'ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n'ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.

20. Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.

21. N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.

22. Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.

23. Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 9