Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 9:16-26 Bible Nso (IGBOB)

16. M'gāchusa kwa ha n'etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M'gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia.

17. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Tugharinu uche, kpọ-kwa-nu ndinyom nābù abù-ákwá, ka ha we bia; ziga-kwa-nu ikpọ ndinyom mara ihe, ka ha we bia:

18. ka ha me kwa ngwa, buliere ayi igo-ákwá, ka anya-miri we si n'anya-ayi rùda, ka miri we si kwa na mbubere-anya-ayi rùputa.

19. N'ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n'ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n'ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.

20. Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.

21. N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.

22. Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.

23. Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:

24. kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n'ebe M'nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n'uwa: n'ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

25. Le, ubọchi nābia, (ọbu ihe si N'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gewere nmehie-ha leta ndi nile bìri úgwù n'ebìghi-úgwù-ha;

26. bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n'ọzara: n'ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n'obi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 9