Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 8:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gēkpoputa ọkpukpu ndi-eze Juda, na ọkpukpu ndi-isi-ya, na ọkpukpu ndi-nchu-àjà, na ọkpukpu ndi-amuma, na ọkpukpu ndi bi na Jerusalem, n'íhì-ha:

2. ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.

3. Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.

4. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Ha ga-ada, ghara ibili ọzọ? madu, ọ̀ gādaghachi azu, ghara ilata?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 8