Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 7:24-34 Bible Nso (IGBOB)

24. Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n'ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n'isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n'iru.

25. Site n'ubọchi ahu nke nna-unu-hà ji si n'ala Ijipt puta rue ta ka M'nēzitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha kwa-ubọchi:

26. ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha.

27. I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.

28. I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n'iyì, ebipuwo kwa ya n'ọnu-ha.

29. Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

30. N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

31. Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'ọku; bú ihe nke M'nēnyeghi n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim.

32. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n'ihi na ebe ilì ozu adighi.

33. Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.

34. M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 7