Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 7:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na agwaghm nna-unu-hà okwu, enyeghkwam ha iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta, bayere ihe nile nke àjà-nsure-ọku na nke àjà ọzọ:

23. kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma.

24. Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha-n'ala, ha we jegharia na ndum-ọdu nile na n'isi-ike nke obi ọjọ ha, ha we daghachi azu, ghara iga n'iru.

25. Site n'ubọchi ahu nke nna-unu-hà ji si n'ala Ijipt puta rue ta ka M'nēzitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha kwa-ubọchi:

26. ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha.

27. I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.

28. I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n'iyì, ebipuwo kwa ya n'ọnu-ha.

29. Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

30. N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 7